Genesis 38

Juda na Tama

1Nʼoge ahụ, Juda hapụrụ ụmụnne ya gaa binyere otu nwoke onye Adulam a na-akpọ Hira. 2Nʼebe ahụ, Juda hụrụ otu nwaagbọghọ, nwa otu nwoke onye Kenan, aha ya bụ Shua. Ọ lụrụ ya ma bakwuru ya. 3Ọ tụụrụ ime mụọ nwa nwoke, onye Juda gụrụ aha Ịa 4Nwunye ya dịkwara ime ọzọ mụta nwa nwoke nke ya bụ nwunye ya gụrụ Onan. 5Ọ mụkwara nwa nwoke ọzọ, onye ọ kpọrọ Shela. Ọ bụ na Kezib ka ọ mụrụ ya.

6Juda lụtaara Ịa, ọkpara ya, nwunye onye aha ya bụ Tama. 7Ma nʼihi na Ịa, ọkpara Juda, dị njọ nʼanya Onyenwe anyị. Onyenwe anyị gburu ya.

8Mgbe ahụ, Juda sịrị Onan, “Bakwuru nwunye nwanne gị ka ịkuchie ya, ka i si otu a wulite mkpụrụ maka nwanne gị.” 9Onan ma na mkpụrụ a agaghị abụ nke ya. Nʼihi ya, mgbe ọbụla ọ bakwuru nwunye nwanne ya, ọ na-anyụsa mkpụrụ nwa ya nʼala, ime ka ọ ghara inye nwanne ya nwoke nwa. 10Ma ihe a o mere jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị. Nʼihi ya Onyenwe anyị gbukwara ya.

11Juda sịrị nwunye nwa ya, bụ Tama, “Laa nʼụlọ nna gị nọrọ dịka nwanyị di ya nwụrụ tutu Shela nwa m nwoke etoo.” Ma echiche ya bụ, “ka ọ ghara ịnwụ dịka ụmụnne ya.” Tama lara gaa biri nʼụlọ nna ya.

12Mgbe ọtụtụ oge gasịrị, nwunye Juda nwa Shua nwụrụ. Mgbe oge nkasiobi ya gasịrị, Juda jere Timna, ya na enyi ya Hira, onye Adulam, ilekọta ndị na-akpụchapụ igwe ewu na atụrụ ya ajị.

13A gwara Tama sị ya, “Nna di gị na-aga Timna ịkpacha atụrụ ya ajị.” 14O yipụrụ uwe mkpe ya, were akwa mkpuchi kpuchie onwe ya gaa nọdụ ala nʼọnụ ụzọ ama Enayim, nke dị nʼụzọ e si aga Timna. O mere otu a nʼihi na ọ matara na Shela etoola, ma enyeghị ya ka ọ bụrụ nwunye ya.

15Mgbe Juda hụrụ ya, o chere na ọ bụ otu nwanyị akwụna, ebe ọ bụ na o kpuchiri ihu ya. 16Ma ebe ọ mataghị na ọ bụ nwunye nwa ya, o jekwuru ya ebe ọ nọdụrụ ala nʼakụkụ ụzọ sị ya, “Bịa, kwere ka mụ na gị dinaa.”

Tama jụrụ, “Gịnị ka ị ga-enye m ma ọ bụrụ na m kwere ka mụ na gị dinaa?”

17Ọ zara, “Aga m ezitere gị otu nwa ewu site nʼigwe ewu na atụrụ m.”

Ọ jụrụ, “Ị ga-enye m ihe akaebe ruo mgbe ị ga-ezite ya?”

18Ọ sịrị, “Kedụ ihe akaebe m ga-enye gị?”

Ọ zara, “Mgbaaka akara gị na eriri ya, na mkpanaka dị gị nʼaka.” O nyere ya ihe ndị a. Ọ bakwuru ya nke mere na ọ tụụrụ ime.
19Mgbe o si nʼebe ahụ pụọ, o yipụrụ akwa ahụ o ji kpuchie ihu ya, yirikwa uwe mkpe ya.

20Mgbe Juda zigara enyi ya onye Adulam ka ọ gaa wegara ya nwa ewu ahụ, ma nataghachi ihe ibe ahụ, ọ hụghị ya. 21Ọ jụrụ ndị ikom bi nʼebe ahụ sị, “Olee nwanyị akwụna ụlọ arụsị ahụ na-anọdụ nʼọnụ ụzọ ama Enayim?”

Ha sịrị, “O nweghị nwanyị akwụna ụlọ arụsị nọrọla nʼebe a.”

22Ya mere, ọ laghachiri gaa gwa Juda, “Ahụghị m ya. Ọzọkwa, ndị ikom ndị bi nʼebe ahụ sịrị, ‘O nweghị nwanyị akwụna
Nʼoge ochie, ụmụ nwanyị akwụna bụ ndị na-efe chi ndị ha na-ewe ka chi ọmụmụ. Jen 38:21
ụlọ arụsị nọrọla nʼebe a.’ ”

23Juda zara, “Ka o jide ihe niile o ji, ma ọ bụghị otu a anyị ga-aghọ ihe ọchị. Lee, ezigarala m ya nwa ewu a, ma gị onwe gị achọtaghị ya.”

24Mgbe ọnwa atọ gasịrị, ozi ruru Juda ntị sị, “Tama nwunye nwa gị gbara akwụna, bịa site nʼịgba akwụna dịrị ime.”

Juda sịrị, “Kpọpụtanụ ya ka akpọọ ya ọkụ.”

25Ma mgbe ha kpọ ya na-apụta, o zigara nna di ya ozi, sị, “Ọ bụ nwoke nwee ihe ndị a tụwara m ime. Ọ sịkwara, Leruo anya ma ị ga-amata onye nwe ihe ndị a: mgbaaka akara a na eriri ya, na mkpanaka a.”

26Juda ghọtara ha, sị, “Ọ bụ onye ezi omume karịa m, ebe ọ bụ na m jụrụ ịkpọrọ ya kpọnye nwa m nwoke Shela ka ọ bụrụ nwunye ya.” O dinakwaghị ya ọzọ.

27Mgbe oge ọmụmụ nwa ya ruru, ejima ka ahụrụ nʼakpanwa ya. 28Mgbe ọ na-amụ ha, otu nʼime ha sepụtara aka ya. Nwanyị na-aghọ nwa weere eriri na-acha uhie uhie kee ya na nkwoji aka kwuo sị, “Ọ bụ nke a bụ ụzọ pụta.” 29Ma nwa ahụ mesịrị sekpuo aka ya, nwanne ya nke ọzọ eburu ya ụzọ pụta. Nwanyị ahụ sịrị, “Ọ bụ otu a ka ị si tikapụta?” A kpọrọ ya Perez.
Perez bụ nna ochie Devid. Rut 4:18-22; Mat 1:3-6; Luk 3:32-33
30Emesịa, nwanne ya, nke bu eriri uhie uhie ahụ na nkwoji aka pụtakwara. A kpọrọ ya Zera.

Copyright information for IboBIU